2027 election: Inec ewepụtala aha mmadụ 4,408 ga-azọ ọkwa ịbanye n'Ụlọomeiwu Etiti na ntuliaka afọ 2027
N'ime aha mmadụ niile ahụ, otu puku, otu narị na iri itoolu na ise (1,195) na-azọ ọkwa maka ịbanye n'Ụlọomeiwu Sịnetị ebe puku atọ, narị abụọ na iri na atọ (3,213) na-achọ ịbanye n'Ụlọomeiwu Nnọchiteanya.